8E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.” (Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.)
9Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.”
10Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.”
11Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha.
12Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu.