13E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke.
14Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya.
15Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
16Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya: Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.
17Mgbe ahụ, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nʼime anyanwụ na-eti mkpu nʼoke olu, na-akpọku ụmụ nnụnụ niile na-efe nʼetiti mbara eluigwe, “Bịanụ! Zukọọnụ maka oke oriri nke Chineke.