Mkpughe 19

Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!”

Revelation 19:4 (UKJV) And the four and twenty elders and the four beasts fell down and worshipped God that sat on the throne, saying, Amen; Alleluia.

2Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.”

3Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.”

4Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!”

5Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị, “Toonu Chineke anyị, unu ndị ohu ya niile, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.”

6Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị, “Haleluya! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.