1Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya! Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị.
2Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.”
3Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.”
4Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!”