Mkpughe 2

Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike.

Revelation 2:15 (UKJV) So have you also them that hold the doctrine of the Nicolaitanes, which thing I hate.

13Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma ị na-anọgidesi ike nʼaha m. Ị jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, ọ bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi.

14Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko.

15Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike.

16Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha.

17Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.