12“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị Pegamọm, sị ya: Ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ ji mma agha ahụ dị nkọ nke nwere ihu abụọ nʼaka ya.
13Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma ị na-anọgidesi ike nʼaha m. Ị jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, ọ bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi.
14Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko.
15Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike.
16Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha.