19Amaara m ọrụ gị niile, na ịhụnanya gị, na okwukwe gị. Amakwaara m ije ozi gị na ntachiobi gị, na-ahụkwa na ị na-arụ ọrụ ugbu a karịa ka i mere na mbụ.
20Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị nye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja.
21Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma ọ jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko.
22Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha.
23Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.