Mkpughe 2

Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị nye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja.

Revelation 2:20 (UKJV) Notwithstanding I have a few things against you, because you suffer that woman Jezebel, which calls herself a prophetess, to teach and to seduce my servants to commit fornication, and to eat things sacrificed unto idols.

18“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira, sị ya: Ndị a bụ okwu sitere nʼaka Ọkpara Chineke, onye anya ya na-enwuba nʼebe niile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka bronz a nụchara nke ọma.

19Amaara m ọrụ gị niile, na ịhụnanya gị, na okwukwe gị. Amakwaara m ije ozi gị na ntachiobi gị, na-ahụkwa na ị na-arụ ọrụ ugbu a karịa ka i mere na mbụ.

20Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị nye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja.

21Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma ọ jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko.

22Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.