3I jirila ntachiobi nagide nhụju anya nʼihi aha m, ma ike agwụghị gị.
4Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere.
5Cheta ọnọdụ i si na ya daa. Chegharịa, mekwa ihe ndị ahụ ị na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịa wepụ ihe ịdọba oriọna gị site nʼọnọdụ ya.
6Ọ bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. Ị kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dịka mụ onwe m si kpọọ ya asị.
7Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke.