Mkpughe 2

Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere.

Revelation 2:4 (UKJV) Nevertheless I have somewhat against you, because you have left your first love.

2Amaara m ihe niile banyere ọrụ gị niile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachiobi gị. Amaara m na ị dịghị anagide ndị ajọ omume, na ị nwaleela ndị ahụ niile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nʼezie, chọpụtakwa na ha bụ ndị ụgha.

3I jirila ntachiobi nagide nhụju anya nʼihi aha m, ma ike agwụghị gị.

4Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere.

5Cheta ọnọdụ i si na ya daa. Chegharịa, mekwa ihe ndị ahụ ị na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịa wepụ ihe ịdọba oriọna gị site nʼọnọdụ ya.

6Ọ bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. Ị kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dịka mụ onwe m si kpọọ ya asị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.