10Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.
11Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha.
12Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.
13Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị.
14Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ.