Mkpughe 20

Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.

Revelation 20:10 (UKJV) And the devil that deceived them was cast into the lake of fire and brimstone, where the beast and the false prophet are, and shall be tormented day and night for ever and ever.

8Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri.

9Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.

10Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.

11Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha.

12Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.