Mkpughe 20

Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri.

Revelation 20:8 (UKJV) And shall go out to deceive the nations which are in the four quarters of the earth, Gog, and Magog, to gather them together to battle: the number of whom is as the sand of the sea.

6Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nʼọnwụ nke mbụ ahụ. Ọnwụ nke abụọ enweghị ike nʼebe ha nọ, nʼihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa ọchịchị puku afọ.

7Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta.

8Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri.

9Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.

10Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.