Mkpughe 21

O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata.

Revelation 21:10 (UKJV) And he carried me away in the spirit to a great and high mountain, and showed me that great city, the holy Jerusalem, descending out of heaven from God,

8Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.”

9Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.”

10O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata.

11O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal.

12Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.