Mkpughe 21

Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya.

Revelation 21:15 (UKJV) And he that talked with me had a golden reed to measure the city, and the gates thereof, and the wall thereof.

13Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.

14Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.

15Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya.

16Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ.

17Ọ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ, dịka ihe ọtụtụ nke mmụọ ozi ahụ si gụpụta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.