23Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.
24Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya.
25A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ.
26Ebube na nsọpụrụ nke mba niile ka a ga-ewebata nʼime ya.
27Ọ dịkwaghị ihe ọbụla rụrụ arụ ga-abata nʼime ya. Otu a kwa, ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, maọbụ onye ụgha ga-abata nʼime ya, kama ọ bụ naanị ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ.