Mkpughe 21

Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya.

Revelation 21:24 (UKJV) And the nations of them which are saved shall walk in the light of it: and the kings of the earth do bring their glory and honour into it.

22O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere.

23Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.

24Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya.

25A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ.

26Ebube na nsọpụrụ nke mba niile ka a ga-ewebata nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.