Mkpughe 21

O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere.

Revelation 21:22 (UKJV) And I saw no temple therein: for the Lord God Almighty and the Lamb are the temple of it.

20nke ise, nkume a na-akpọ ọniks, nke isii, nkume a na-akpọ kanelian, nke asaa, nkume a na-akpọ krisolaịt, nke asatọ, nkume a na-akpọ beril, nke itoolu, nkume a na-akpọ topaazi, nke iri, nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu, nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ, nkume a na-akpọ ametisiti.

21Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ pieal iri na abụọ, ọnụ ụzọ ama ọbụla ka e ji otu nkume pieal rụọ nʼotu nʼotu. Ihe e ji rụọ okporoụzọ dị nʼobodo ahụ bụ naanị ọlaedo a nụchara anụcha ọbụla, nke dị ọcha dịka enyo e hichaziri nke ọma.

22O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere.

23Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.

24Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.