14“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Laodisia, sị ya: Ndị a bụ okwu Amen, onye kwesiri ntụkwasị obi, na onye bụ ezi onyeama, bụrụkwa isi mmalite ihe niile Chineke kere.
15Amaara m ọrụ gị niile, na ị jụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ. Ọ gaara adị nnọọ mma ma asị na ị na-ajụ oyi ma ọ bụkwanụ na-ekpo ọkụ.
16Nʼihi nke a, ebe ị na-ajụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ, ihe ị dị bụ ṅaraṅara. Nʼihi ya, aga m esi nʼọnụ m gbụpụ gị.
17Nʼihi na ị na-asị, ‘abụ m ọgaranya, nwezuo ihe niile. Mkpa ihe ọbụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ. Ị bụ onye e kwesiri imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ.
18Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ị ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. Ị gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka ị zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma.