19Ndị m hụrụ nʼanya ka m na-abara mba na-enyekwa ha ahụhụ. Ya mere, nwee ịnụ ọkụ nʼobi, chegharịakwa.
20Lee, ana m eguzo nʼọnụ ụzọ na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m ma meghee ụzọ, aga m abata soro ya rikọọ ihe, ya onwe ya ga-esokwa m rie ihe.
21Onye ọbụla na-emeri emeri, ka mụ ga-enye ikike ka o soro m nọdụ nʼocheeze m. Ọ bụladị dịka m meriri sorokwa Nna m nọdụ nʼocheeze ya.
22Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.”