Mkpughe 4

Nʼihu ocheeze ahụ e nwere ihe dịka oke osimiri e ji enyo mee, nke na-enwu dịka kristal. Nʼetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ya, e nwere anụ anọ dị ndụ nwere anya nʼakụkụ ahụ ha niile, ihu na azụ.

Revelation 4:6 (UKJV) And before the throne there was a sea of glass like unto crystal: and in the midst of the throne, and round about the throne, were four beasts full of eyes before and behind.

4Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nʼocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha.

5Mgbe ahụ, ụda dịka ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke sitere nʼocheeze ukwu ahụ na-ada na-achapụtakwa. Nʼihu ocheeze ukwu ahụ, e nwere oriọna asaa na-enwu ọkụ. Oriọna ndị a bụ mmụọ asaa nke Chineke.

6Nʼihu ocheeze ahụ e nwere ihe dịka oke osimiri e ji enyo mee, nke na-enwu dịka kristal. Nʼetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ya, e nwere anụ anọ dị ndụ nwere anya nʼakụkụ ahụ ha niile, ihu na azụ.

7Nke mbụ nʼime anụ ndị ahụ dị ndụ nwere oyiyi dịka ọdụm. Nke abụọ dịka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dịka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe.

8Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “ ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile dị,’ bụ onye ahụ dịkwaarị, onye ahụ na-adị, na onye ahụ na-aga ịbịa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.