Mkpughe 5

Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile.

Revelation 5:9 (UKJV) And they sung a new song, saying, You are worthy to take the book, and to open the seals thereof: for you were slain, and have redeemed us to God by your blood out of every kindred, and tongue, and people, and nation;

7Ọ gara nʼihu were akwụkwọ ahụ site nʼaka nri onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ.

8Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ.

9Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile.

10Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.”

11Mgbe ahụ, elere m anya, hụ ma nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi, nke ọnụọgụgụ ha ruru puku kwụrụ puku, na nde kwụrụ nde. Ha gbara ocheeze ahụ gburugburu, na anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.