Mkpughe 6

Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu.

Revelation 6:4 (UKJV) And there went out another horse that was red: and power was given to him that sat thereon to take peace from the earth, and that they should kill one another: and there was given unto him a great sword.

2Mgbe m lere anya, ahụrụ m ịnyịnya dị ọcha. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ụta nʼaka ya. A tụkwasịkwara okpueze nʼisi ya dịka onye agha na-emeri emeri mgbe niile.

3Mgbe o meghere akara nke abụọ, ngwangwa, anụrụ m ka anụ nke abụọ ahụ nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ tiri mkpu sị, “Bịa!”

4Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu.

5Ma mgbe o meghere akara nke atọ, anụrụ m ka anụ nke atọ ahụ dị ndụ kwuru, “Bịa!” Ahụrụ m ịnyịnya dị ojii. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nʼaka ya.

6Anụkwara m ihe dị ka olu nke sitere nʼetiti anụ anọ ahụ dị ndụ na-adapụta sị, “Otu ihe ọtụtụ kilo nke ọka wiiti bụ ụgwọ ọrụ otu ụbọchị, ihe ọtụtụ kilo atọ nke ọka balị bụkwa ụgwọ ọrụ otu ụbọchị. Ya mere, unu emebikwala mmanụ oliv na mmanya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.