1Ahụrụ m mgbe Nwa atụrụ ahụ meghere otu nʼime akara asaa ahụ. Otu nʼime anụ anọ ahụ dị ndụ tiri mkpu dịka a ga-asị na ọ bụ egbe eluigwe sị, “Bịa!”
2Mgbe m lere anya, ahụrụ m ịnyịnya dị ọcha. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ụta nʼaka ya. A tụkwasịkwara okpueze nʼisi ya dịka onye agha na-emeri emeri mgbe niile.
3Mgbe o meghere akara nke abụọ, ngwangwa, anụrụ m ka anụ nke abụọ ahụ nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ tiri mkpu sị, “Bịa!”
4Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu.