3na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.”
4Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.
5Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
6E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). E sitere nʼebo Manase họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
7Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).