Mkpughe 7

na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.”

Revelation 7:3 (UKJV) Saying, Hurt not the earth, neither the sea, nor the trees, till we have sealed the servants of our God in their foreheads.

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi.

2Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri,

3na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.”

4Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.

5Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.