1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi.
2Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri,
3na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.”
4Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.