18E sitere nʼihe mmekpa ahụ ndị a, ire ọkụ, anwụrụ ọkụ na nkume ọkụ na-adịghị anyụ anyụ, ka ha ji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ niile bi nʼụwa.
19Ike ịnyịnya ndị a dị nʼọnụ ha, na ọdụdụ ha. Ọdụdụ ha dị ka agwọ, nwee isi agwọ nke ha ji emerụ mmadụ ahụ.
20Ma ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ, bụ ndị a na-egbughị site nʼihe ntaramahụhụ ọrịa ndị a, echegharịghị site nʼọrụ aka ha maọbụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha niile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na bronz na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị na-apụghị ịhụ ụzọ, maọbụ ịnụ ihe, maọbụ ije ije.
21Ha echegharịghị site nʼigbu mmadụ ha, maọbụ ụzọ mgbaasị ha, maọbụ ndụ ịkwa iko ha, na izu ohi ha pụta.