Mkpughe 9

Nʼime ụbọchị ndị ahụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.

Revelation 9:6 (UKJV) And in those days shall men seek death, and shall not find it; and shall desire to die, and death shall flee from them.

4E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọbụla, maọbụ osisi na ihe ọbụla a kụrụ nʼala. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọbụla na-enweghị akara Chineke nʼegedege ihu ya.

5Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị a, kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Mmekpa ahụ ha dịka ahụ ụfụ na nhụju anya nke akpị mgbe ọ gbara mmadụ.

6Nʼime ụbọchị ndị ahụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.

7Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka ịnyịnya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ.

8Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.