24Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha.
25Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
26Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi.
27Ọzọkwa, kama ha na ndị inyom inwe mmekọrịta; ndị ikom ha họọrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta nke ha na ndị inyom kwesiri inwe. Nwoke na-edinakwuru nwoke ibe ya. Nʼụzọ dị otu a, ha natakwara ntaramahụhụ kwesiri ha nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme.
28Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chineke nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ niile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.