22Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu.
23Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesiri inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ. Ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na nnụnụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nʼala.
24Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha.
25Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
26Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi.