Ndị Rom 10

Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”

Romans 10:16 (UKJV) But they have not all obeyed the gospel. For Isaiah says, Lord, who has believed our report?

14Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị?

15Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”

16Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”

17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.

18Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.