13Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.”
14Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị?
15Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”
16Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”
17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.