11Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
12Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke.
13Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.”
14Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị?
15Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”