5Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.”
6Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ” (nke bụ, ikudata Kraịst)
7“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ).
8Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa.
9Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.