Ndị Rom 10

Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.

Romans 10:9 (UKJV) That if you shall confess with your mouth the Lord Jesus, and shall believe in yours heart that God has raised him from the dead, you shall be saved.

7“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ).

8Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa.

9Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.

10Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị.

11Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.