23Ma ọ bụrụ na ha anọgideghị na-ekweghị ekwe, a ga-anyapagidekwa ha nʼihi na Chineke pụrụ ịnyapagide ha ọzọ.
24Nʼihi na asị na e gbupụtara unu site nʼalaka osisi oliv ọhịa, nyapagide unu nʼosisi oliv ọma ahụ nʼụzọ na-abụghị usoro ndụ, gịnị kwanụ ga-egbochi ịnabata alaka ndị ya, bụ ndị si na ya, mee ka ha laghachi azụ nʼosisi oliv ahụ e si nyakapụ ha.
25Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru.
26Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya, “Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa.
27Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.”