27Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.”
28Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha.
29Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke.
30Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha.
31Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu.