Ndị Rom 11

Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu.

Romans 11:31 (UKJV) Even so have these also now not believed, that through your mercy they also may obtain mercy.

29Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke.

30Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha.

31Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu.

32Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya.

33Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.