Ndị Rom 11

“Onye burula ụzọ nye Chineke ihe, nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?”

Romans 11:35 (UKJV) Or who has first given to him, and it shall be recompensed unto him again?

33Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta.

34“Onye maara uche Onyenwe anyị? Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?”

35“Onye burula ụzọ nye Chineke ihe, nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?”

36Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.