3“Onyenwe m, ha egbuchala ndị amụma gị niile, mebisiekwa ebe ịchụ aja gị niile, maọbụ naanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.”
4Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.”
5Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya.
6Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu.
7Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha.