2Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel?
3“Onyenwe m, ha egbuchala ndị amụma gị niile, mebisiekwa ebe ịchụ aja gị niile, maọbụ naanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.”
4Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.”
5Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya.
6Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu.