Ndị Rom 11

Dịka e dere ya, “Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe; o mere nke a ruo taa.”

Romans 11:8 (UKJV) (According as it is written, God has given them the spirit of slumber, eyes that they should not see, and ears that they should not hear;) unto this day.

6Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu.

7Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha.

8Dịka e dere ya, “Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe; o mere nke a ruo taa.”

9Devid kwukwara, “Ka tebul ha ghọọrọ ha igbudu na ọnya, ha bụrụkwa ihe ịsọ ngọngọ na ntaramahụhụ nye ha.

10Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ. Mee ka azụ ha bụrụ ihe arọjiri arọji ruo mgbe ebighị ebi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.