Ndị Rom 12

Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.

Romans 12:1 (UKJV) I plead to you therefore, brethren, by the mercies of God, that all of you present your bodies a living sacrifice, holy, acceptable unto God, which is your reasonable service.

1Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.

2Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.

3Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.