Ndị Rom 12

Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha.

Romans 12:3 (UKJV) For I say, through the grace given unto me, to every man that is among you, not to think of himself more highly than he ought to think; but to think soberly, according as God has dealt to every man the measure of faith.

1Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.

2Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.

3Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha.

4Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche,

5nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.