5Otu onye nwere ike na-eche na otu ụbọchị kacha ndị ọzọ na ịdị nsọ, onye nke ọzọ nwekwara ike na-eche na ụbọchị niile bụ otu ihe, ma o kwesiri ka onye ọbụla kpebiere onwe ya.
6Onye ọbụla na-eche nʼotu ụbọchị bụ nke pụrụ iche, na-eme nke a nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla na-eri otu ihe na-eri ya nʼihi Onyenwe anyị. Ma onye na-adịghị eri otu ihe ahụ na-eme kwa nke a nye Onyenwe anyị. Ma na-enyekwa Chineke ekele.
7Nʼihi na o nweghị onye nʼime anyị na-adịrị naanị onwe ya ndụ, o nwekwaghị onye nʼime anyị na-anwụrụ naanị onwe ya ọnwụ.
8Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị.
9Ọ bụ nʼihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, ma biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ.