Ndị Rom 15

Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu.

Romans 15:2 (UKJV) Let every one of us please his neighbour for his good to edification.

1Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ.

2Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu.

3Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!”

4Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.