1Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ.
2Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu.
3Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!”