21ma dịka e dere ya, “Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ, ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.”
22Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu.
23Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a.
24Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta.
25Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem ebe m na-ejere ndị nsọ ozi.