19nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst.
20Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere Kraịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ,
21ma dịka e dere ya, “Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ, ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.”
22Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu.
23Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a.